Editọ ANPC, Oranye emeela ncheta ọgbụgba afọ ya
ỤLỌỌRỤ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC),Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọakụkọ Nationa Light, Ka O Dị Taa naSportslightXtra nọ ụbọchị Tuzdee, sonyere editọ ha, Oriakụ Rose Oranye dịka otinyere otu afọ na ndụ ya (birthday). E ji abụ otito weemalite ya, ebe a nọ wee kelee Chineke maka ezi ndụ onyere ya. Ụfọdụ ndị hụrụ yan’anya bịara na ANPC wee soro ya ṅụrịa. Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụSir Chuka Nnabuife gọọrọ ya ọfọ ndụ, ihe ọma ihe ọma dịka o kelere Chineken’isi ya ma rịọkwaa ya ka o duru ya na-aga. Ọ gọkwaara ndịọrụANPC na ndị niile gbakọrọ maka mmemme ahụ ọfọ. Chukwubuike Oranye, n’akụkụ nke ya kelere Chineke maka ngọzịya n’ebe ezigbo nne ya nọ. O kelere nne ya maka ịhụnanya ya ma kpekwaa ka ona-agawanye n’ahụike. Ọ gara n’ihu kpọkuo Chineke n’isi ndị niile bịara soronne ya ṅụrịa, ka ngọzị bụrụ nke ha. Otu onye ọrụ ANPC,Oriakụ Uchenwa Mba kelere Chineke maka ndụ Oriakụ Oranye, bụ editọ ha. O kwurusị: “Editọ anyị nwere mmụọ mmadụ, bụrụ ezigbo onye nne ma were yana-et