N’Onitsha, gọọmenti Anambra akasiela ndị ọkụ gbara ahịa ha obi
ỌCHỊCHỊ steeti Anambra agaala njem nleta n’ebe ahụ ọkụ ọgbụgba dapụtara na nsonso a n’Onitsha dị n’ime steeti ahụ, bụkwa ebe ọ nọrọ wee kasie ndị niile ya bụ ọkụ ọgbụgba metụtara obi. Ozi nkasiobi a bụ nke e ziri site n’ọnụ Osote Gọvanọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim, onye duru ụfọdụ ndị isi ọchịchị steeti ahụ, nke gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka ọkụ na mmiri, bụ Injinia Julius Ezenwanne, na ụfọdụ Kọmishọna ndị ọzọ, wee gaa ebe ahụ ya bụ ihe mere, n’aha aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo. N’okwu yá n’ebe ahụ, Dọkịta Ibezim kọwàrà ya bụ ajọ ọdachi dịka nke jọgburu onwe ya, ma gbarụọ ihu na ụdị ọdachi dị otu ahụ abụrụla ihe a na-ahụtazị nà mgbe na mgbe n’ime steeti ahụ. Kaosiladị, o kèlèrè Chineke na o nweghị onye ọbụla tụfùrù ndụ ya n’ihi ọkụ ọgbụgba ahụ, ma kọwakwa na ebumnobi njem nleta ahụ bụ ka o jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ, dịka o siri metụta ọnụọgụgụ ihe ya bụ ọkụ bibiri. O kwuru na nke ahụ ga-enyekwara gọọmenti aka