Igwe Chidume agbaala ofala n'Omor
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a n’obodo Omor dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum nke steeti Anambra, dịka eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Oranu Chidume mèrè emume ịgba ọfala ya n’ụzọ pụrụ iche, bụkwa nke o jiri merùbe afọ ise o jiri banye n’ọkwa dịka eze ọdịnala obodo ahụ. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’òbí eze ọdịnala ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ, ndị òtù dị icheiche, ndị ichie na ọtụtụ ndị ọzọ sikwa ebe dị icheiche wee bịa isonye na ya. N’okwu ya n’ebe ahụ, Igwe Chidume kwupụtàrà obi ụtọ ya, ma nyekwa Chineke ekele maka ọrụ ọma dị icheiche o ji ya arụ n’obodo ahụ kemgbe afọ olenole gara aga, ma kelekwazie ụmụafọ obodo ahụ maka ezi nkwàdo ha na ekpere ha nyegara ọchịchị ya, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ha ka ha gaa n’ihu ime nke ahụ. O mere ka a mara na obodo ahụ bụ ndị na-akọsi ọrụ ugbo ike, bụkwa nke e jiri mara ha n’ụwa gbaa gburugburu, tinyere omenala na ọdịnala dị icheiche e jiri mara ha, nke ha sikwa na ha wee na-akwalite ọnatarachi na njirim