Omenugha agbapuorola ndị Nnobi ụmị mmiri ọñụñụ, tinyesie ọkụ okporo ụzọ
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a dịka Dọkịta Nelson Omenụgha gbapuuru ndị obodo ya mmiri ọñụñụ, ma tinyesikwara ha ọkụ okporoụzọ ji ike si n’anyanwụ were arụ ọrụ. Ya bụ mmiri bụ nke Dọkịta Omenugha gbapuuru ndị Umuru dị na Nnobi, n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nke steeti Anambra, ebe ọkụ okporoụzọ ahụ bụkwa nke a rụnyesiri n’okporoụzọ dị n’ógbè ahụ. N’okwu ya oge ọ na-agbape mmiri ọñụñụ ahụ, Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ekwulọbịa, bụ ‘Most Revd’ Peter Okpalaeke, kọwara ọrụ ọma ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma kèléé Dọkịta Omenụgha maka ịmalite, ịrụchapụ na inyefè mmiri ahụ n’aka obodo ahụ, bụkwa nke ọ kọwara dịka ihe kwesiri nñòmi. Ọ kọwara nwaokorobịa ahụ bụ Dọkịta Omenụgha dịka onye nne na nna ya zụrụ nke ọma, zụlite ya n’egwu Chineke, ma kụnyekwa ezi mkpụrụ n’ime ya, bụkwazị nke o gosipụtagoro site n’ezi ọrụ. Dịka ọ na-agọzi mmiri ahụ, Bishọọpụ Ọkpalaeke gọziri nwoke ahụ gbapuru ya bụ mmiri, kpeere ya ekpere ọganihu, ma kpọkukwazie ndị ọzọ bụ ndị C