Mmemme iri ji ọhụrụ n’ala omenala Igbo
IRI ji ọhụụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọ n’ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị icheiche ma na-ahụtakwa ya dịka nke maọbụ nke ọzọ. Kaosiladị, ọ na-abụ e gburìsie anụ enyi, o kwere obubu, maka na ọ bụrụ na ọ̀kpụ́aja akọwaghị ihe ọ kpụrụ, òfèkè nwere ike ịkpọ nwansu amụ dike. Ọ bụ nke a mere o jiri dị mkpa ịkọwa ihe ‘Iri Ji Ọhụụ’ bụ n’ala Igbo, ọkachasị dịka otu n’ime omenala na nnukwu mmemme e jiri mara ndị Igbo. Ihe sūrū, à gbábá ya, ọ bụghị egwu, ọ bụrụ ọsọ. N’ịgbasò nke ahụ, iri ji ọhụụ bụ otu n’ime omenala dị icheiche e ji mara ndị Igbo n’ụwa gbaa gburugburu. Ọ bụ mmemme omenahọ ma bụrụkwa nke ezi nwaafọ Igbo ọbụla na-esonyesi ike na ya. Mmemme iri ji ọhụụ bụ oge e ji enye Chineke ekele n’ihi onyinye ji, ya na nchebe Ya na ndụ O nyere ụmụ mmadụ wee ruo n’oge owuwe ihe ubi; maka na ọ na-abụ a kọ̀ọ́, gwute, a sị na ahọ amagbuo onwe ya. Ọ bụkwa oge a ka ndị Igbo ji akwanyere ji ugwu ruuru ya dịka eze nke ihe niile a kọrọ n’ubi, dịka akụkọ okike