Posts

Showing posts with the label Olili Ọnwa Ịsaa

Ezi-Agulu Aguleri emeela olili Ọnwa Ịsaa nke 2020

OMENALA bụ ọbara na-ehù na ndụ àgbụrụ, ma bụrụkwa nwata toteo tokwuru.   Nke a bụ nke pụtaraihè n’ozùzuoke, dịka Ndi Ezi-Agulu Aguleri, bụ obodo dị n’okpuru ọchịchị‘Anambra East’ nke steeti Anambra, merùbèrè emume Olili Ọnwa Ịsaa nke ahọ 2020,bụ otu nnukwu mmemme e jiri mara obodo ahụ.   Ya bụ oke mmemmewééré ọnọdụ n’ogige Ama-Ụmụala dị n’obodo ahụ, bụ mmemme omenahọ dịgoro ọkpụrụtọrọkpụn’obodo ahụ, ma bụrụkwa nke a na-eme n’ọnwa Ọkụtoba kwà ahọ.   N’okwu ya na mmemmeahụ, onyeisioche ‘Ikenga Ezi-Agulu Forum’, bụ Maazị Basil Manafa kọwara nammemme ahụ nwere ihe jikọrọ ya na Alọmmụọ, bụ mmemme iri ji ọhụụ obodo ahụ, bụnke a na-emegide wee ruo Ọnwa Ịsaa.   Ya bụ mmemme, dịka osiri kọwaa, bụ nke ebumnobi ya bụ ịkwalite omenala, ijikọ obodo ahụ ọnụ na ịkwàliteEziagụlụ Ụnọ site n’iwèpụta atụmatụ mmepe bụ ịgbà, na ịkwàlite ịdịnotù, udo na ịhụnanya,nakwa ịgbà ụmụafọ obodo ahụ ume.   N’okwu nke ya, eze ọdịnalaobodo Enugu Agụleri, bụ Igwe Ezechukwu Emeka-Eri kọwara omenala dịka otu ndị siebi ndụ