Posts

Showing posts with the label Olawo Moyinoluwa

Lee nwaanyị bụ eze ọdịnala (Oba) n'ala Yoruba

… Omenala machiri ya ịtụ ime OLAWO Moyinoluwa dị afọ iri abụọ na anọ oge e kpụnyere yaokpu eze dịka Onibule nke Ibulesoro, n’okpuru ọchịchị Ifedore na steeti Ondo. Ọnọchiri anya nna ya Oba Joseph Fowole chịburu obodo ahụ. Sọọsọ ya bụ nwaanyị bụonye eze ọdịnala na steeti ahụ ugbu a.   Muyinoluwa agụchaalamahadum wee turu ugo. Ọ gụrụ ihe ọmụmụ Microbiology na Ondo State University ofScience and Technology, Okitipupa. A gbasoro usoro omenala na ọdịnala wee chieya eze.  Ọtụtụ ndị mmadụekweteghị na nwaanyị nwere ike ịbụ eze ọdịnala na Yoruba. E nwere ike ichinwaanyị echichi ọdịnala dị iche iche n’obodo ụfọdụ n’ala Yoruba mana a gaghịechi ha eze ọdịnala.   Otu o sila dị, ntọnala(history) Ibulesoro, bụ obodo dị n’akụkụ Akure isi steeti ahụ dị iche. Ọmachighi ikpunye nwaanyị okpu eze dịka Oba ma ọ bụrụ na nwaanyị ahụ bụ nwa Obaka chịcharanụ.   Otu onye obodo ahụaha ya bụ Sayo Lawoyin kwuru maka Oba nwaanyị ahụ sị: “Ọ bụ ezigbo onye otuKriast, onye ekwenyeghị n’omenala ọjọọ (fetish traditions).