Okpuru ọchịchị Njikọka ekèéla ụmụafọ ya ihe oriri agbamume
GỌỌMENTI okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambranọrọ n’ọdịnso a wee kesàára ihe erimeri gburu nde kwùrú nde naịra nyegara obododị iche iche dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ahụ. Atụmatụ ikesà ihe abụ nke weere ọnọdụ n’Abagana, bụ isi obodo Njikọka, ma bụrụkwa nke onyeisi ochenchere oge n’okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị George Ozo nọrọ na ya wee nyefee iheerimeri ahụ n’aka ndị ndu obodo dị iche iche n’ime okpuru ọchịchị ahụ ka ha weega kesaara ndị obodo ha. Ka ọ na-eme nke ahụ,Maazị Ọzọ kọwara dịka otu ụzọ okpruru ọchịchị ahụ chọrọ isi mee ka ọnọdụ dịrị ụmụafọya mma, bèlatara ha ihe isi ike, ma mekwa ka ha nwee ihe oriri gbàànyụụ n’imeoge a e tiri iwu sị onye apụtakwala ezi n’ihi ọrịa nje korona. Ọ kọwara na hazùbèrè ime ka ya bụ erimeri rute, opekata mpe, ezinụlọ iri ise n’ime obodo ọbụladị n’okpuru ọchịchị ahụ, ọbụnadị dịka ọ kpọkùrù ụmụafọ okpuru ọchịchị ahụ ka hanabata ihe ndị ahụ etu ahụ ma gaa n’ihu na-erube isi nye ntụziaka ahụ gọọmentinyèrè iji gbanarị ibute maọbụ ik