Posts

Showing posts with the label Okpoko

Okpoko: A gwala ndị rụgasịrị ụlọ ebe ekwesighị ka ha kụtuo ha

ỤLỌỌRỤ na-ahụ maka nhazi ewumewu ụlọ na steeti Anambra, bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board (ASPPB)’ akpọkuola ma dụọ ndị dị icheiche rụrụ ụlọ n’ebe okporoụzọ na ọwàmmiri gara ka ha kụtusie ụlọ ahụ n’oge adịghị anya.   Onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board’, bụ Maazị Chike Mmaduekwe bụ ya kpọrọ oku a oge ya na ndị òtù ọrụ ya gara inye ákàrà ịdọ aka na ntị n’ụlọ ndị ahụ dịchisiri ụzọ n’Okpoko, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ogbaru ka ha kụtuo ulọ ndị ahụ n’ụzọ, n’ihi nnukwu ọrụ ahụ gọọmenti chọrọ ịbagide na mpaghara ebe ahụ n’oge adịghị anya.   Ọrụ inye akara mwepù n’ụlọ ahụ bụ nke a malitere na nsonso a, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee hụta ma nye akara n’ụlọ karịrị narị abụọ n’ọnụọgụgụ dịka ụlọ ndị mmadụ a ga-akụkpọ na mpaghara ahụ n’ihi na ha dị ebe ekwesighị ekwesi wee na-egbochi mmiri na idè mmiri ịgara onwe ya nke ọma na ihubànyè n’ime Ohimiri Naịja (River Niger).   Maazị Mmaduekwe kọwara na etu ndị mmadụ siri rụchisi ụlọ n’okporoụzọ na n’ebe ọwammiri so n