Ọkụ agbagbuola nwaanyị dị ime na ụmụ ya abụọ n'Okija
ỌKỤ agbagbuola otu nwaanyị dị ime na ụmụ ya abụọ n’Umuoffor Okija, nke dị n’okpuru ọchịchị Ihiala na steeti Anambra. Onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweoji ‘Police Public Relations Officers’ bụ Haruna Mohammed kwupụtara nke a n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Onitsha ụnyaahụ. Mohammed kwuru na ndị ahụ ọkụ gbagburu nọ na be ha mgbe ọdachi ahụ dapụtara. O kọwara sị, “ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri na iteghete n’ihe dịka elekere asaa na ọkara nke uhuru chi, ọkụ gbara n’Umuoffor Okija n’ezinaụlọ Maxwell Okeke. N’ihi nke ahụ, nwunye ya dị ime bụ Oriaku Nwazuru Okeke na ụmụ ya abụọ; Chidi dị afọ abụọ na Makuo dị afọ atọ gbara ọkụ pịatapịata. Ndị uweojii na-elekọta ngalaba Okija gara ebe ahụ ma menyụọ ọkụ ahụ site n’enyemaka ndị gbutara ọsọ.” Mohammed, onye kwuru na achọpụtabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ kwukwara na kọmishọna uweojii, Maazị Rabiu Ladodo enyela iwu maka nnyocha bụ ịgba iji chọpụta ihe kpatara ọdachị ahụ.