Nri ndị Igbo: Ojoko a hụrụ n'ọkụ
OJOKO bụ nri ọtụtụ mmadụ n’enwe mmasi iri mana nri dị n’ime ojoko ma azụ ya bụ ọgwụ. Onye afọ na asa ọ na enwe ike ọgwụgwụ o rie ojoko a hụrụ n’ọkụ, nwa oge o nweta ike na ume. E ji ojoko chara acha e si agwa, e jikwa ojoko chara acha eri osikapa ma e ghee ya eghe. Taa anyị ga ekwu maka ojoko a hụrụ n’oke na otu e si eri ya. Ugbua, n’akụkụ ụzọ niile dị na obodo mepere emepe maọbụ n’ime obodo ị ga-ahụ ndị n’azụ ahịa ojoko a hụrụ n’ọkụ. E ji izụ ahịa ojoko a hụrụ n’ọkụ azụ ụmụaka, e jikwa ya akwụ ụgwọ ụlọ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Otu a ka ndị ji ya atụ mgbere si akwado ya. Ha sie agwa o ghee nke ọma, ha ekponye unyi n’ihe e ji esi unyi, ha etinye ya ọkụ were ihe e ji amị anụ tụkwasi n’elu ọkụ ahụ, wụkwasa ojoko chara acha na nke achaghị n’ọkụ ahụ na-atụgharị ya ka ọ ghara ire ọkụ. O ghee, I wepụcha azụ ya, I bericha ojoko ahụ kịrịkịrị, kunye agwa na ya, tinye mmanụ, yabasi, nnu, ose, ị gwọkọọ ya nke ọma, wukwasi ya ụtazi I bere kịrịkịrị n’elu ya, ọ bụrụzie oriri. Ọ bụrụ na ịchọghị iji