Oge ekpomọkụ na ihe na-eso
E NWERE oge dị iche iche n’elu ụwa. Oge ekpomọkụ bụ otu n’ime ha. Chukwu kere ụwa mere ka ọ dị otu ahụ. Nke ọbụla oge ya ruru ọ malite. N’oge ahụ, dịka aha ya siri dị, ebe niile na-ekpo ọkụ. Ihe niile na-eku ume nke gụnyere mmadụ na anụọhịa tinyere osisi dị n’ọhịa na-achọ ikuku na mmiri. Ahụ na-agba onye ihu na onye azụ gharaghara, ọbụladị osisi dị n’ọhịa na-agbụchasị akwụkwọ ebe ahịhịa na ọtụtụ ihe ndị a kọrọ n’ubi na-akpọnwụsị. Oge ekpomọkụ na-abụkwa oge ụkọ mmiri, n’ihi na ọ na-abụ oge ọkọchị, mgbe mmiri anaghị ezo. Ọ bụladị ụfọdụ mmiri a na-echu echu na-ata. N’ihi ahụ ịcha ọkụ, mmadụ na anụmanụ na-achọ mmiri ọṅụṅụ n’ike n’ike. A na-aṅụ mmiri karịa ka e si aṅụ n’oge ndị ọzọ tinyekwara ịsa ahụ oge niile. Ekpomọkụ enweghị onye ọ hara, ihe nri ndị e debere n’ụlọ na-emebi ebe ndị e siri esi na-agbakarị ụka, dịka ofe. Ihe ndị a gosipụtara na onweghị onye ekpomọkụ hara. Otu o sila dị, ihe niile na-eme n’oge ya. Ọ bụrụ na-enweghị oge ekpomọkụ, ihe niile agaghị adaba dịka Chi ke