Abụ maka Naịjirịa
Oge Afrịka Pita Ejiọfọ dere nke a IHE a kpọrụ “Oge Afrịka” Dị eziokwu, n’AlaIgbo, Mgbe ọbụla e nwere ọgbakọ, O kpuru okpueze, were oche. A ga-ama ọkwa, dọọ aka na ntị, Na oge Afrịka adịkwaghị na nke a, Na nzukọ ga-ebidokwa ka e kwuru, N’elekere iri kpọmkwem. Mọọbụ na “tualfụ”na-akụ akụ, Ka onye ọbụla wee laa ngwa. Ma mgbe ahụ ruo, kama mmadụ, Oge Afrịka ewere ọnọdụ. Mkpụrụ mmadụ atọ “amaghị ihe”, Abịa ka e kwuru, nọrụ na-eche, Ndịọzọ anọrụ n’ụlọ na-ajụ, “Abịawala ha?”, na-eme ihe ha na-eme. Ọ gachaa awa abụọ oge a kara, Ogene Oge Afrịka akụọ, Ndị nzukọ ekulie, jiri nkpọ, Kuru akụpe, jụrụ ọha,na-abịa. Mgbe ọgbakọ mechaara bido, E bidorịị gbuwe nke bụ oge, Ịkpọgota ndị tebulu n’oche, Erikwa otu awa nke ya. Nnukwu mmadụ ọbụla bịa, Nzukọ akwụsị, e bido tuwe ya aha, O kelewe onye ọbụla n’otu n’otu, Oge Afrịka ana-aga. Mgbe ọgbakọ ga-anọzị n’uju, Mgbanụ, mgbanụ eweghara. Ọ bụrụ n’oriri, a bụọ nri na mmanya, Kọọ ọnụ so ya, kụrụ mgbanụ laa. Mgbe mbụ e chere, na ọ bụ, Akụwaghị sleeti mere y