Iju mmiri: Agwọ na-arịbatazị n'ụlọ ndị mmadụ n'Ogbaru
ỤMỤANỤMANỤ ọjọọ na-arị arị (reptiles) dịka agwọ na-arịbachazịn’ụfọdụ ụlọ ndị mmadụ n’okpuru ọchịchị Ogbaru na steeti Anambra n’ihi iju mmirina-eto ebe ahụ. Maazị Arinze Awogu,onyeisioche (Transition Chairman) nke kansụl Ogbaru onye kwuputara nke a kọwarana ụfọdụ ndị ọ chụpụrụ n’ụlọ na-agazi na kampụ ebe gọọmenti Anambra kwadooroha. Awogu kwuru naosimiri Niger na-eto n’ike n’ike mere na iro, tinyere ọwa mmiri na-abanyen’osimiri ahụ na-alaghachịzi azụ. O kwuru na o pekata mpe ndị mmadụ dị otu pukun’ọnụọgụ akwapụla n’ụlọ ha. Ogbaru na obodo irina isii mejuputara ya bi n’akụkụ osimiri Niger. O kwuru na nnukwu agwọ (cobra)rịbara n’ụlọ mmadụ n’Atani bụ nke e gburu site n’enyemaka ndịuweojii AtaniDivisional Police Station. Dịka o siri kwu, egburu agwọ ahụ n’Atani, na nwoke e gburu ya gbanahụrụ agwọ ahụ ịta ya n’abalịahụ dịka ọ nọ n’obere ụlọ (boys quarters) na-achọ ihe dị ya mkpa. O kwuru sị; “Dịka ọhụrụ agwọ ahụ, ọ kpọchịrị ụzọ ozigbo ma kpọọ ndịuweojii divishọn Atani bụ ndị bịaraw