Posts

Showing posts with the label Ofe mpoto

Nri ndị Igbo: Ofe mpoto

OFE mpoto na-atọ ụtọ, mana ụfọdụ ga-ajụ gịnị bụ mpoto? Mpoto bụ akwụkwọ ede. Ede nke a na-eri akwụkwọ ya bụ nke e ji esi ofe. Mgbe e ji akụpụta mpoto bụ mgbe ede nasiri, akwụkwọ ikpeazụ dị n’ede. Ịkụpụtachaa ya, ị kpasaa ya n’anwụ. Ọ bụrụ na ụgụrụ dị, abalị atọ ọ kpọọ, ị chịpụ ya debe ebe ọkụ ga na-efesa ya ka ụmụarụrụ ghara ịba na ya. Ama m na ndị maara maka ofe mpoto na-elo ọnụ mmiri ugbu a.   Otu a ka e si esi ofe mpoto: Ị chịta ole ị chọrọ iji sie ofe, were aka gị gbarie ya ka ọ dị kịrịkịrị, denye ya mmiri malite n’ụtụtụ ruo abalị, ị nọọ o bere oge, saa ya maka aja. Saa ya ihe dịka ugboro atọ.   Ihe ndị e ji esi ofe mpoto bụ ndị a: azụmkpọ, okporoko, ịra, okpeyi, magị, ose, nnu, mmanụ. Ị ga-esite mpoto ahụ aka ka o wee ghee nke ọma.   E jikwa egwusi esi ofe mpoto maọbụ I were obere ede rọọ ya.