Posts

Showing posts with the label Ofe achara

Nri ndị Igbo: Ofe achara

NA nri ndị Igbo nke izu a anyị ga-eje steeti Abia. Anyị ga-esi ofe achara. Ụfọdụ ga-asị gịnị bụ ofe achara ebe ụfọdụ ga-asịkwa gịnị bụ achara ma ọ bụ a na-eri achara eri?   Otu a ka e si akwado nakwa ka e si esi ofe achara. E mechaa ị ga-ahụ na ofe achara na-atọ ụtọ. Ị ga-ebu ụzọ kwadochaa ihe niile ị ga-eji sie ofe achara tutu ibido isi ya.   Ị gaa ugbo, I weta achara ma ọ bụ igota achara n’ahịa, ị bata ị wepụsịa azụ achara nke siri ike ruo n’etiti ya, ị ga-ahụ nke esighị ike, nke ahụ ka ị ga-ewepụta ị ga-eji sie ofe.   I wepụchaa ole ị ga-eji sie ofe, ị malite ịgbaji ya kịrịkịrị, ị gbajichaa ya ị debe ya. Ị kwọọ egwusi, ị wunye egwusi ahụ ị kwọrọ n’ikwe, tinye obere mmiri na ya, ị sụkọọ ya nke ọma, ị malite ịkpụ egwusi ahụ kịrịkịrị.   Ị kpụchaa egwusi ahụ i debe. I sinye anụ, ọ bụghị sọọsọ anụ ehi, ị chọọ ị were anụ ewu, ọkụkụ, nchi, i sikọọ ya na okporoko. Ị wụpụ ya debe, ị gbanyezie mmiri ị ga-eji sie ofe n’ite sinye n’ọkụ. Mmiri ahụ gbọọ ị wụnye egwusi ahụ ị kpụrụ sibe ya, ị gaghị

Nri ndị Igbo: Ofe achara

NA nri ndị Igbo nke izu a anyị ga-eje steeti Abia. Anyịga-esi ofe achara. Ụfọdụ ga-asị gịnị bụ ofe achara ebe ụfọdụ ga-asịkwa gịnị bụachara ma ọ bụ a na-eri achara eri?   Otu a ka e si akwadonakwa ka e si esi ofe achara. E mechaa ị ga-ahụ na ofe achara na-atọ ụtọ. Ịga-ebu ụzọ kwadochaa ihe niile ị ga-eji sie ofe achara tutu ibido isi ya.   Ị gaa ugbo, I wetaachara ma ọ bụ igota achara n’ahịa, ị bata ị wepụsịa azụ achara nke siri ikeruo n’etiti ya, ị ga-ahụ nke esighị ike, nke ahụ ka ị ga-ewepụta ị ga-eji sieofe.   I wepụchaa ole ịga-eji sie ofe, ị malite ịgbaji ya kịrịkịrị, ị gbajichaa ya ị debe ya. Ị kwọọegwusi, ị wunye egwusi ahụ ị kwọrọ n’ikwe, tinye obere mmiri na ya, ị sụkọọ yanke ọma, ị malite ịkpụ egwusi ahụ kịrịkịrị.   Ị kpụchaa egwusi ahụi debe. I sinye anụ, ọ bụghị sọọsọ anụ ehi, ị chọọ ị were anụ ewu, ọkụkụ, nchi,i sikọọ ya na okporoko. Ị wụpụ ya debe, ị gbanyezie mmiri ị ga-eji sie ofen’ite sinye n’ọkụ. Mmiri ahụ gbọọ ị wụnye egwusi ahụ ị kpụrụ sibe ya, ị gaghịekwe ka ọ gba