Posts

Showing posts with the label Ofe ańara

Nri ndị Igbo: Ofe ańara

 AŃARA bụ akwụkwọ nri anyị na-akọ n’ala anyị. Akwụkwọ ańara bụ ọgwụ, ọ na-enye ọbara.   Nke a bụ ụzọ dị iche iche e ji eri akwụkwọ ańara. E ji akwụkwọ ańara agwọ ji, e ji ya ata abacha, e ji ya esi ofe, a na-agwọkwa akwụkwọ ańara na ụkpaka agwọ wee taa. Akwụkwọ ańara e ji esi ofe abụghị nke na-amị afụfa okpookpo.   E ji akwụkwọ ańara e si ofe egwusi, e ji ya esi ofe ọgbọnọ, e ji ya esi ofe ọkwụrụ, e ji ya esi ofe achị, a na-esikwa sọ ofe akwụkwọ ańara.   N’izu a anyị ga-esi ofe akwụkwọ ańara na egwusi. Otu a ka e si esi ya: ị sikọọ anụ debe, sinye okporoko. Egwusi ahụ ị ga-eji sie ya, tinye ya obere mmiri ka o wee jekọọ ọnụ. Ị kpụọ ya obere obere tinye ya n’okporoko ahụ sị n’ọkụ, ọ gaa nkeji iri tinye azụ mkpọ, ịra, ose, magi, nnu, mmadụ, okpenyi. Suo mkpụrụ ụzịza wunye kpuchie ya, ọ gaa nkeji iri, ị lee ma egwusi o gheela. Ihe ị ga-eji mara ma o gheela bụ na ị gụpụta ya suo ya ọdụ, o sie ike ị mara na egwusi ahụ ghere, ị gụpụchaa ha, wunye n’ikwe were ọdụ gbarie ya wụghachi ya n’ite.