Posts

Showing posts with the label Ofe ọkwụrụ

Nri ndị Igbo: Ofe ọkwụrụ

OFE ọkwụrụ dị mma, ọ bụkwa otu n’ime akwụkwọ nri na-enye ma na-edozi ahụ nke ọma.   Ofe ọkwụrụ adịghị ahịa ahụ n’osisi. Ọ bụrụ na ọbara kọrọ mmadụ n’ahụ, o rie ofe ọkwụrụ na ụgụ otu izuụka onye ahụ enweta onwe ya nke ọma.   Ihe ndị a ka e ji esi ofe ọkwụrụ nakwa otu e si esi ya. Ị weta ọkwụrụ ole ị chọrọ isi, sachaa ya wunye na nyọ, ị bee ya otu na-amasi gị, ị bechaa ya I debe. I sikọọ anụ na kanda ị ga-eji sie ofe, ị gbanye mmiri ofe sinye n’ọkụ, wunye okporoko, o ghee, wunye azụ mkpọ maọbụ azụ a mịrị amị, tinye nnu, o ghee I tinye mmanụ, ose, okpenyi, magi, ira, nnu. Ọ bụrụ na yabaasi na-amasi gị I suo ya maọbụ I bee ya tinye. I kpuchie ya, o ghee I lee ma nnụ ọ tụrụ ya, I wunyezie ọkwụrụ ahụ I bere, tinye akwụkwọ ụgụ maọbụ akwụkwọ ụzịza I bere kịrịkịrị kuchie ya. Ọ gaa nkeji ise fọtuo ofe ọkwụrụ gị werezie nri akpụ, nri ede, garị, nri ji maọbụ nri e sere ese ọbụla ribezie ya. Ị richaa ofe ọkwụrụ, ụra eburu gị ozigbo.