Posts

Showing posts with the label Ofe ọgbọnọ

Nri ndị Igbo: Ofe ọgbọnọ

OFE ọgbọnọ bụ otu ofe mmadụ nwere ike ịsị n’ihi na ọ hịaghị ahụ isi. Mana ofe ọgbọnọ hịara ahụ maka na ị kpachaghị anya, ọ gbọọfuo n’ala. Ofe ọgbọnọ na-atọ ụtọ ma ị mara sie ya nke ọma.   Otu a ka e si esi ofe ọgbọnọ: i weta ọgbọnọ ole ị chọrọ isi, ị suo ya n’ikwe maọbụ ị kwọọ ya n’igwe e ji akwọ ihe ofe. I sinye okporoko, o ghee, I sinye anụ, o ghee, ị wụpụ ya. I gbanye mmiri ị ga-eji sie ofe, ọ gbọọ I tinye mmanụ, ose, nnu, magị, okpeyi, ịra na azụ mkpọ, I kwuchie ya.  ọ gaa nkeji iri ị wụnye ọgbọnọ ahụ ị kwọrọ, I kpuchie ya mana ị ga-anọ nso maka ọ gbọọ ka ọ ghara iwufu n’ala. Ị ga-esi ọgbọnọ ahụ ka o ghee nke ọma. Akwụkwọ nri ndị I nwere ike iji sie ọgbọnọ bụ nke a: onugbu, ụgụ na ụzịza. I wunye azụ, okporoko na kanda ahụ I sikọrọ na otu n’ime akwụkwọ nri ọbụla ị chọrọ iji sie ya, ọ gaa obere oge, i lee ma o gheela. O ghee, I were nri akpụ a sụrụ nke ọma maọbụ nri e sere ese nke ọma wee kebezie ya.