Posts

Showing posts with the label Ofala Onitsha

Obi Onitsha agbaala Ọfala nke iri na asaa

N’IHI na a sị na ihe emeghị n’izu, o mee n’ọnwa; eze ọdịnala Ọnịtsha, bụ Obi Nnaemeka Alfred Achebe, ewerela oke ọñụ dara ụda wee merùbe mmemme ịgba ọfala ya, àgbà nke iri na asaa ya. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ na mpaghara Ime Obi na Awka Road dị n’Ọnịtsha, ma bụrụkwa nke a kwàdòrò site n’aka ụlọ ọlụ ‘Globacom Nigeria Limited’ (GLO), bụ ụlọ ọlụ mbụ ala nke Nigeria na-eme ihe gbasaara nzikọrịta ozi ekwentị. Óké mmemme ahụ dọtara imrikiti ndị mmadụ sitere na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria na mpụga ya, nke gụnyere ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti, ndị eze ọdịnala, ndị nnọchi anya ala Nigeria, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, tinyere ndị otu dị iche iche. N’okwu ya na mmemme ahụ, Igwe Achebe, bụ onye ọñụ juputara óbì, kelere Chineke n’ihi ndụ, ngọzị na ọganihu, nke o jigoro chọọ ya onwe ya na ndị ọ na-achị achị mma, ma kelekwazie òtù dị iche iche bịara isonyere ya na ya bụ oke mmemme, bụ nke ọ kọwara dịka otù n’ime omenala e jiri mara ndị obodo ahụ. Ọ kwara arịrị banyere ajọ ọnọd