Nri ndị Igbo: Odudu (ndudu)
NRI ndị Igbo nke izu a bụ otu n’ime nri dị ụkọ n’oge a. Onwere aha mpaghara ọ bụla na-akpọ ya. Ụfọdụ na-akpọ ya odudu, nzamili, ndudu maọbụụza. Mgbe e ji akụ odudubụ oge a na-akọ ji, ọ na-eko n’elu osisi ya. Mgbe ọka akpọbeghị nkụ, a ghọta yae sie ya, o ghee a taa mkpụrụ ya. O ruo oge ana-ebulata ji ụlọ, a ghọpụtachaa odudu ahụ. E ji odudu ata akị ma e ghee ya n’ọkụ. A na-esi odudu otu esi esi ịgba ọka. Otu a ka e si esi ma na-akwado ịgba odudu: ị mata iko ole ị chọrọisi, i ghee ya n’ọkụ, buru ya gaa n’igwe na-akwọ ihe mkpọ, ị kwọchaa ya, ị wụnyeya n’ihe ị ga-eji gwọkọ ya, ị gbanye ya mmanụ, ị gwọkọba ya. Ị gwọkọchaa ha ọnụ, tinye mmiri. Mmiri agaghị akarị ya ka i weenwee ike ikechi ya n’akwụkwọ. I nwere ike iji iko mmiri ara ehi kunye ya. I sinyemmiri n’ọkụ ọ gbọọ i tinye odudu ahụ i kechichara n’ite kpuchie ya. I ga-esiteya aka ka o wee ghee nke ọma. N’ezie, odudu di mman’ahụ, dịka agwa, ụkwa na fịọfịọ.