N'Obosi, ụmụokorobịa awakpòla, kwatuo ụlọụka maka nsogbu ókè ala
NDỊ ntorobịa iwe juru obi nọrọ na nsonso a wee wakpò ma bibie otu ụlọụka a maara dịka ‘Olu Ndi Enigwe Adoration Ministry’ dị n’Obosi, n’okpuruọchịchị ‘Idemili North’ nke steeti Anambra, n’ihi nsogbu ịzọ oke ala na-adapụta n’etiti ndị obodo ahụ na ndị nwe ụlọ ụka ahụ, bụ nke binwuuru ọkụ na nsonso a. Ya bụ nsogbu oke ahụ bụ nke malitere kemgbe, ma bụrụkwa nke ka na-agawanye n’ihu ugbua n’agbànyèghị ntụnye dị icheiche na oku ikpe udo niile ndị e ji okwu ha agba izu kpọgoro n’etiti ndị ụka ahụ na ndị obodo ahụ, ma nke e mere site n’aka Ashbishọọpụ Valerian Okeke nke ụka Katọliki na Dayọsis Ọnitsha, na ụfọdụ ndị ọzọ. N’agbànyèghị mgbataọsọ niile ahụ, akụkọ kọzịrị na ndị ntorobịa Obosi jiri iwe, buru katapịla, wee ga kwatuo ụlọụka ahụ, tikpọ̀sịa ihe dị icheiche e ji aka ụka n’ebe ahụ, ma tikwa ụfọdụ ndị ụka ahụ nọ ebe ahụ ihe tupu chụpụ ha n’ala ahụ. N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere nke ahụ, onye mgbazi nke ime mmụọ n’ụlọụka ahụ, bụ Rev. Fr. Jude Uche Olundienigwe kọwara na ala ebe