COVID-19: Obijackson ejirila akụrụngwa ahụike kwàdo gọọmenti Anambra
IGBO sị na ótù onye anaghị achụ ngwèrè mgbahige aja, maka naọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyi, ọ dị mfe. N’ịgbaso nke a, Dọkịta Ernest Obiejesi, bụkwa onyeisi ụlọọrụObijackson nọrọ na nso nso a wee bunye gọọmenti steeti Anambra akụrụngwa nlekọtaahụike dị iche iche, iji kwàdo ya n’agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje CoronaVirus, bụkwa ọrịa a maara dịka COVID-19. N’inyefè gọọmenti ihe ndị ahụ ka ya bụ nwa amadi, DọkịtaObiejesi kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka ezi mbọ dị iche iche ọ gbàgòrò n’aghaahụ a na-ebu megide ya bụ ọrịa, ọ kachasị iji hụ na ọ batàghị n’ime steeti ahụ. O mekwazịrị ka a mara na ya bụ akụrụngwa ahụike bụ iji dọnyereya úkwù na agbambọ ahụ, kwàlite ezi ọnọdụ nchekwa ahụike ụmụafọ steeti ahụ nandị ọrụ ahụike, ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ bìé ya bụ ọrịa aka n’ala. Akụrụngwa dị iche iche o bùtèrè gụnyèrè ihe e ji ekpuchi imikarịrị puku anọ, tinyere akụrụngwa e ji eyichi ahụ karịrị nàrị abụọ n’ọnụọgụgụ. N’okwu ya oge ọ na-anabàta ihe ndị ahụ n’aha gọọmenti steetiAnambra, odeakw