Olileanya ndị Anambra ka Obiano na-enyefe ọchịchị n'aka Ọkammụta Soludo
NDUBISI Nwokedi : Ọchịchị Obiano dị ezigbo mma. Nhafe ọ na-eme n’aka Soludo gosipụtara na steeti Anambra ga-adị mma na-aga n’ihu. Soludo n’onwe ya makwaara ihe ekwe na-akụ dịka Obiano. Ọ bụ ezigbo mmadụ; ọbụladị mgbe ọ nọ n’isi ọbaego ala anyị, o mere nke ọma. Ọ bịara maka ezi ọchịchị, ọbụghị nke mmegbu. Ọ bịara ka o mezie obodo. Ọfọ ọma ka m na-agọrọ ya, nchekwa Chukwu, udo na ọńụ. Otu a Obiano na-ahafe ọchịchị n’aka Soludo ga-agazi. Ajọ ihe agaghị eme ya. Otu a Chukwu họpụtara ya ka ọ chịa, ọ ga-achịrụ anyị n’isi. Nebechukwu Okafor : Obiano metara ndị ọrụ mma. Anyị na-asịzị ka onye na-abata ọhụrụ mekwa ka o mere. Ọ bụ Obiano hibere ọdụụgbọelu na steeti Anambra, bụ oke obodo kwesịrị ka o nwee ọdụụgboelu kemgbe. O teela aka a tụbara atụmatụ ịrụ ọdụụgbọelu na steeti Anambra ma onweghị isi. Ka ọ dị ugbu a, ọchịchị Obiano emeela ka steeti Anambra sonye n’ụgbọ ọma. Agara m ebe ahụ wee hụ n’ebe niile achawapụla. N’ezie, Obiano gbara mbọ dị egwu. Ya mere, ọ bụrụ na Soludo soro ụkpụrụ ya,