Gọọmenti etikpọọla ngwuru ndị omekome n'Oba
GỌỌMENTI steeti Anambra ewelitekwuola aka n’agha ahụ ọ na-ebu megide ndị omekome nà ndị ọzọ na-eme mpụ dị icheiche na steeti, dịka ọ wakporo, kụtuo ma bibie otu n’ime ebe nzuzo ndị ntọ na steeti ahụ. Mwakpo ahụ na ịkwatu ebe nzuzo ahụ bụ nke ndị ọrụ nchekwa dị icheiche jikọtara aka ọnụ wee mee n’Oba, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Idemmili South nke steeti ahụ, bụ ebe ha kwaturu otu ụlọ ala ebe ndị omempụ ahụ jiri mere ebe nzuzo na ebe ha na-edebesi ụfọdụ ndị mmadụ ha tọ̀tàrà. Tupu a kwatuo ụlọ ahụ, ndị ọrụ nchekwa ahụ bu ụzọ wakpo ụlọ ahụ, bụkwa ebe ha jidere ụfọdụ ndị omekome ahụ na ndị ọzọ a na-enyo enyo na ha na ha na-arụkọ. Ihe dị icheiche e nwetekwara n’ebe ahụ gụnyere ụdị mma dị icheiche, egbe, okwu arụsị, anwụrụ̀ ike, ụdị ekwentị dị icheiche, ọkụ, ego, ọgwụ a gwọrọ agwọ, mgbọ egbe a gbabeghị agba, m̀kpà, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ. Ndị omempụ ahụ ka e kwuru na ọ bụ ha kpara ọtụtụ mkpamkpa a kpagasịrị n’akụkụ ebe dị icheiche na steeti ahụ Anambra na nsonso a, nke gụnyere ọrụ ịtọ̀r