Posts

Showing posts with the label Nwando Obiano

Nwando Obiano agaala ụka ịtụ mmamma maka mbulielu n'ọkwa Perm Sec ọhụrụ

ÓKÉ ọñụ dị ukwu dàrà na nsonso a, dịka Dọkịta Ọkaiwu (Oriakụ) Nwando Obiano na ndị ezinụlọ ya, ndị ikwu na ibè ya, ndị enyi ya na ndị na-echere ya ezi echichi, gara ụkà ịtụ mmamma na inye Chineke ekele maka mbuli n’ọkwa e buliri ya dịka odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpọ n’isi ụlọọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti Anambra.   Ụka ịtụ mmamma ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St. Theresa’s Catholic Church, Nibo’, n’okpuru ọchịchị ‘Awka South  nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izù na ngalaba dị iche iche, bụ ndị sitere mpaghara ebe dị iche iche wee bịa, nke gụnyere ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti, ndị omeiwu, ndị ji ego achụ ego, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ bịara sonye na ya bụ mmemme.   N’okwu ya na mmemme ahụ, Ọkaokwu ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti Anambra, bụ Uchenna Okafor, ónyé kọwara mbulielu ahụ dịka ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike na ọkpụkpọoku maka ịdịwanye uchu n’ọrụ, kelèrè onye ahụ e buliri n’ọkwa ọhụrụ ma tòkwá Gọvanọ Willie Obianọ dịka g