Posts

Showing posts with the label Nwa oje ozi

Nwa oje ozi esila n'ụlọelu okpukpu abụọ wụpụ iji gbanahụ ntaramahụhụ

NDỊ ọrụ nchekwa The Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) nke steeti Abia azọpụtala otu nwata nwaanyị gbara afọ iri na atọ aha ya bụ Uduak Willy, bụ onye oje ozi si n’ụlọelu okpukpu abụọ wụpụ ka o were gbanahụ ntaramahụhụ (punishment) a chọrọ inye ya.Ya bụ ihe mere n’Aba.   Kọmandant nke steeti ahụ, Maazị Vincent Ogu kwuputara nke a n’ozi ọ gwara ndị ntaakụkọ n’ofiisi ya dị n’Umuahia na Tuzdee.   Ogu kwuru na nwata nwaanyị ahụ kpara agwa ahụ dịka e bochara ya ebubo na o zuru narị naịra ise (N500) wee na-achọ ka e tie ya ihe.   Ndị ya na ha bi bụ Emeka Igwe na nwunye ya bụ Aniekan.   Ka ọ dị ugbu a, ọ kọwara na a nwụchikọọla Igwe na ọgọ ya nwaanyị bụ Christiana Godwin maka itinye aka n’ịtụ mgbere mmadụ, mmegbu ụmụaka, ntaramahụhụ ezinaụlọ na ịchọ ka ha gbuo mmadụ.   O kwuru na onye mere ka kọmandị ha mata banyere nke ahụ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ maka ihe gbasara ụmụaka na-eto eto (Teenage Matters) bụ Oriakụ Chinamenma Umesaka.   Ogu kwuru sị: “Oge m nwetara ozi gb