Nri ndị Igbo: Ji abana abụbọ
ABANA bụ otu nri ndị Igbo ụfọdụ chefugoro taa mana abana mara mma nke ukwuu. Abana bụkwa ọgwụ nye ụfọdụ ọrịa dị ugbu a. Ọ dị onye ọbụla nwere ọrịa mamịrị (diabetes), ọ bụ abana ka a na-asị ya ribe, maka na onweghị shuga. Ọ dị ụzọ abụọ e si eri abana. Oge abana ji atọ ụtọ bụ oge ọkọchị, mgbe ahụ mmiri amịkọchala n’abana. I sichaa abana, i were mmanụ suru ya, maọbụ i mee abụbọ were suru ya. Ihe e ji eme abụbọ bụ nke a: akwụkwọ ụgụ, akwụkwọ inine, akwụkwọ onugbu. I sie ya n’ọkụ o ghee, ị sụọ ya n’ikwe, tinye ụkpaka, mmanụ, ose, nnu, ị sụkọọ ha niile ọnụ. I tinye ya mmiri dị ńara ńara, ị kwọkọọ ha ọnụ, werezie ya surube abana ahụ.