Posts

Showing posts with the label Nri ede

Nri ndị Igbo: Nri ede/ụtara ede

N’IZU a anyị ga-ekwu maka nri ede. Ndị ọ gbara ọhụrụ ga-asị kedu ihe bụ nri ede, mana nri ede a so na nri ndị nna anyị ha jiri zụọ ụmụ ha.   Ede niile ka e ji asụ nri ede. A na-akọ ede n’ala Igbo niile. Ọtụtụ ụzọ ka e ji eri ede, e ji ya eme achịcha ede, e ji ya esi ofe, a na-eri akwụkwọ ede eri. Ede nke ndị Igbo na-eri akwụkwọ ya bụ ede e ji esi ofe. O ruo oge ọkọchị, akpapụta akwụkwọ ikpeazụ ede ụrị, kpasaa ya n’anwụ, ọkpọọ a chipụ ya, e ji ya esi ofe, e ji ya agwọ ede. Ede bara uru dịka ihe oriri ndị ọzọ.   A na-asụ ede ka e si asụ akpụ. Nri ede mara mma, ọ dịghị enye nsogbu n’afọ.   Otu a ka e si akwado nri ede: ị weta ole ị chọrọ isi, sachaa ya nke ọma maọbụ bechapụ azụ ya, sinye ya n’ọkụ. Sie ya ka ọ chaa achaa ka o wee nye gị ihe ị chọrọ. Tụchapụ ya wụnye n’ikwe sụba ya n’ọkụ ka ọ ghara ịgba mkpụrụ, ị chọọ, I tịnye akpụ maọbụ garị, ị sụkọọ ya nke ọma, ị kọpụ ya n’ikwe.   Ofe ị ga-eji rie nri ede gị bụ nke a: ofe onugbu, ofe egwusi, ofe ọgbọnọ, ofe mpoto (ofe e ji akwụkwọ ede sie

Nri ndị Igbo: Nri ede/ụtara ede

N’IZU a, anyị ga-ekwu maka nri ede. Ndị ọ gbara ọhụrụ ga-asị kedu ihe bụ nri ede, mana nri ede a so na nri ndị nna anyị ha jiri zụọ ụmụ ha.   Ede niile ka e ji asụ nri ede. A na-akọ ede n’ala Igbo niile. Ọtụtụ ụzọ ka e ji eri ede, e ji ya eme achịcha ede, e ji ya esi ofe, a na-eri akwụkwọ ede eri. Ede nke ndị Igbo na-eri akwụkwọ ya bụ ede e ji esi ofe. O ruo oge ọkọchị, akpapụta akwụkwọ ikpeazụ ede ụrị, kpasaa ya n’anwụ, ọkpọọ a chipụ ya, e ji ya esi ofe, e ji ya agwọ ede. Ede bara uru dịka ihe oriri ndị ọzọ.   A na-asụ ede ka e si asụ akpụ. Nri ede mara mma, ọ dịghị enye nsogbu n’afọ.   Otu a ka e si akwado nri ede: ị weta ole ị chọrọ isi, sachaa ya nke ọma maọbụ bechapụ azụ ya, sinye ya n’ọkụ. Sie ya ka ọ chaa achaa ka o wee nye gị ihe ị chọrọ. Tụchapụ ya wụnye n’ikwe sụba ya n’ọkụ ka ọ ghara ịgba mkpụrụ, ị chọọ, I tịnye akpụ maọbụ garị, ị sụkọọ ya nke ọma, ị kọpụ ya n’ikwe.   Ofe ị ga-eji rie nri ede gị bụ nke a: ofe onugbu, ofe egwusi, ofe ọgbọnọ, ofe mpoto (ofe e ji akwụkwọ ede si