Onye omeiwu Anambra, Okafor arụgharịarala nwaanyị ajadụ ụlọ ya ọkụ gbara na Nnewi
OMERE nwaogbenye na-emere Chi kere ya, maka na ọrụ ọbụlawèrè ụgwọ so ya. Ọ bụ n’ịgbasò nke aka onye omeiwu ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi North’ n’ụlọ ọgbakọomeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Nonso Okafor jiri rụzigharịa ma dozigharịaraotu nwaanyị ajadụ ụlọ ya dakpọsịrị adàkpọdị n’Umuzu Mbana, Otolo Nnewi. Ya bụ ụlọnwéré ime ụlọ anọ a rụzigharịrị ọhụụ bụ nke a gbàpèrè, nyefèé ya n’aka nwaanyịàjàdụ ahụ na nsonso a; ma bụrụkwa nke a gbapegidere ya na ụlọ mposi na ogigeebe a na-asa ahụ. N’okwu ya oge ọna-agbape ụlọ ahụ, onye omeiwu ahụ, bụ Maazị Okafor kọwàrà nke ahụ dịka otun’ime ụzọ o si eme ka ihu ọchị waa ndị ọ na-anọchite anya ha n’ụlụ omeiwusteeti ahụ, na-eme ka ọnọdụ dịrị ha mma, ma na-ewètekwara ha èrèrè ọchịchị onyekwuo uche ya. O mere ka a mara na ọnọrọ n’abalị iteghete nke ọnwa Julaị ahọ a wee nweta ozi na ụlọ ótù nwaanyịajadụ, bụ Oriakụ Eberechukwu Igwilo na-agba ọkụ n’Umuzu Mbana dị n’Otolo Nnewi.O kwuru ọ bụ ezie na ndị àgbataobi nwaanyị ajadụ ahụ nyèèrè ya a