Ndị Nnobi emeela emume Ịkpọ Ji
ỌKWÀ mbà na-achị n’olu n’olu. Omenala bụkwà nwata tote o tokwuru, ma bụrụkwa ọbara na-ehù na ndụ agbụrụ ọbụla. Ka ọ dị taa, ndị obodo Nnobi dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili South’ nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee mee otu omenala pụrụ iche e jiri mara obodo ahụ, bụ nke a maara dịka mmemme Ịkpọ Ji Nnobi, nke ahọ 2021. Ya bụ oke mmemme bụ otu n’ime ụzọ ndị obodo ahụ si echekwaba ma na-akwàlite omenala Igbo, ma bụrụkwa emume ha ji ekele Chineke maka onyinye ji ọhụrụ, gọzie ma doo ji ọhụrụ nsọ n’obodo ahụ tupu a malite iri ya maọbụ ire ya n’ahịa obodo ahụ bụ Afọr Nnobi. Ọ bụ n’ụbọchị ahịa afọr ikpeazụ nke ọnwa Julaị ahọ ọbụla ka ndị Nnobi na-eme emume ịkpọ ji, bụkwa nke ha na-eji amalite ire maọbụ igo ji ọhụrụ n’ahịa ha, nke na ọ bụrụ na e meghị ya, ị mara na o nweghị onye ọbụla ga-anwa ànwà bubàta, ree maọbụ rie ji ọhụrụ n’ahịa obodo ahụ. Dịka omenala Nnobi siri dị, ọ bụ Isiana Nnobi na-anọ n’isi mmemme ahụ, bụkwazị nke a ga-emerịrị tupu eze odịnala obodo ahụ maọbụ ụmụ