Posts

Showing posts with the label Nnamdi Azikiwe

Obiano akpọọla oku ime aha Azikiwe ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọọla òkù ka emee aha Dọkịta Nnamdi Azikiwe lagoro mmụọ ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ karịa etu ọ dị ugbua.   Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a n’okwu ya na mmemme Nkụzi Zik (Zik Lecture) àgbà nke iteghete na agba nke iri ya, bụ nke weere ọnọdụ na Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Tuzdee ma bụrụkwa mmemme a na-achịkọba kwà ahọ ọbụla iji kwanyere ya bụ oke mmadụ, bụ Azikiwe, ùgwù.   Ọ dị ncheta na ya bụ gọvanọ nọrọ n’ahọ 2019 wee kwuwaa na ụbọchị ahụ a mụrụ Zik, bụ abalị iri na isii nke ọnwa Nọvemba ahọ ọbụla ga na-abụzị ụbọchị ezumike na steeti ahụ, iji kwanyere ya ugwu. Ọ bụzị n’ịgbàkwụnye na nke ahụ ka Gọvanọ Obianọ jizị akpọ òkù ka e mee ka ụbọchị ezumike ahụ bụrụzie nke a ga na-enwezị na steeti niile dị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ na n’ala Nigeria n’izugbe.   Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu, kpọkwàrà òkù ka e weghàc