Òtù ejirila ígwè e ji akwa akwà kwàdo ụmụnwaanyị n’Anam
OKE ọñụ dara na nsonso a, dịka òtù ọrụ enyemaka a maara dịka ‘Nnakwe Foundation’ jiri ígwè e ji akwa ákwà wee kwàdó ọtụtụ ụmụnwaanyị dị iche iche n’Ifite-Anam, n’okpuru ọchịchị Anambra West, nke steeti Anambra. N’okwu ya na mmemme ahụ, onye nwe òtù ọrụ enyemaka ahụ, bụ Maazị Simeon Nnakwe, onye obodo Oroma-Etiti Anam dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anambra West, mèrè ka a mara na ígwè ahụ bụ onyinye afọ òfùfò e nyere òtù ahụ site n’aka Maazị Osita Offozor, bụ onye obodo Umuikwu Anam, ma birikwa mba South Africa, ebe ọ nọ azụ ahịa. Ọ gara n’ihu kwuo na ígwè ahụ e ji akwa akwa dị iri na asaa n’ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke ebumnobi e jiri kesàá ya bụ iji wee nye ụmụnwaanyị ahụ nkwàdo iji bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha; ọbụladị dịka o kelere ya bụ nwoke bunyere ha akụrụngwa ahụ, ma kpee ka Chineke kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji. Dịka ọ na-akpọku ndị ahụ ketara òkè n’akụrụngwa ahụ ka ha jiri ya bàára onwe ha uru ma jirikwa ya mepụta ihe a hụrụ anya, dịka a na-atụ anya n’aka ha; Maazị Nnakwe kwèrè