Nnọkwa eriela ji ọhụrụ
O KWÒRÒ èkwò ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Nnokwa, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili South’ nke steeti Anambra merùbèrè mmemme iri ji ọhụrụ nke obodo ahụ, nke ahọ a bụ 2021. Oke mmemme ahụ wèèrè ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Emmanuel Ajamma dọtara ụmụafọ obodo ahụ, ma ọnọnụlọ ma ọnọnụzọije, ndị nwadiala Nnokwa, ndị ọgọ, ndị ikwu na ibè na ndị na-echere obodo ahu ezi echiche, tinyere ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù, bụ ndị sitere ebe dị iche iche na gburugburu steeti ahụ na mpụga ya wee bịa. Ka ọ na-eme omenala ịwa ji kpọnkwem na mmemme ahụ, Igwe Ajamma, onye wara ji ahụ ibe atọ kwupụtara obi ụtọ ya maka etu ọrụ ugbo ahọ a siri gaa na Nnọkwa, nakwà etu Chineke siri chekwaba ma debe ha ndụ, ha wee kọọ ma gwute n’ụba. Dịka ọ na-eme ka a mara na Nnọkwa so n’otu n’ime obodo si na Nri bụ isi ala Igbo wee pụta, ọ kọwara na iri ji ọhụrụ bụ emume ndị Igbo ji akwanyere ji ùgwù pụrụ iche dịka eze ihe a kọrọ n’ubi, ma kọwakwa mkpà