N'Anambra, gọọmenti ebidola ọrụ n'okporoụzọ Nkpor-Umuoji
GỌỌMENTI steeti Anambra ebidola ọrụ n’ùjú n’okporoụzọ ahụ siri Nkpor gaa Umuoji, bụ nke debere ime na ọnụ ka ntọọọ n’oge mbụ. Ya bụ ọrụ okporoụzọ bụ nke ọ bụ alaka ụlọọrụ na-ahụ maka ndozi okporoụzọ n’ime okpuru isi ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ na steeti Anambra, bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Road Maintenance Agency ARMA’ na-ahụ maka ya. Ka ya bụ ọrụ malitegoro n’ùjú ugbua bido n’ikpụ̀chàsị̀ okporoụzọ ahụ, ịgba aja n’elu ya, ịwụ ya okwute, na ịrụ ọwà mmiri n’akụkụ ya abụọ, a hụkwazị̀rị̀ okwute na aja ebe ahụ, ebe ụdị katapila dị icheiche nà tipa nọkwàzị̀ n’ọrụ ebe ahụ. N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere ya bụ ọrụ, onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Road Maintenance Agency’ bụ Injinia Azuka Egwuatu kọwàrà na mbido ahụ bụ nke e mere site na ntụziaka Ọchịora steeti ahụ, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo, onye o kwuru na ọ bụ ya gwara ha malite ọrụ ebe ahụ ozigbo, oge ọ nụchara akụkọ banyere ihe ndị mmadụ na-agabiga n’okporoụzọ ahụ. Ọ kọwàrà na ụzọ ahụ bụ nke obosara ya dị kilomita iri abụọ, ma kwuo na h