Posts

Showing posts with the label Nkpor

ANSPPB akụtuola ụlọ a rụrụ ebe iwu akwadoghị na Nkpor

Ọ NA-ABỤ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụfèé aja, e bute ozu ya n’ofete nke ọzọ.   O wee bụrụ etu ahụ ka ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board’ (ANSPPB) siri wee kụtuo ụlọ a rụrụ n’ebe iwu akwdòghị na Nkpọr dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra.   N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ANSPPB, bụ Maazị Chike Mmadueke kọwara ya bụ ọrụ ịkụtu ụlọ ahụ dịka nke dabara adaba n’usoro iwu n’ihi na ya bụ ụlọ bụ nke a rụchiri n’ebe okporoụzọ siri gaa n’akụkụ ụlọ abụọ ọzọ, ma bụrụkwa ebe e si abanye n’okporo ụzọ ọzọ dịkwa n’akụkụ ebe ahụ, bụzị nke mere ka ọ na-esiri ndị bi na mpaghara ahụ ike ịbanye n’ụlọ ha, ma ya fọdụzie ịgafè n’ebe ahụ.   Ọ kọwara na ebumnobi ụlọọrụ ahụ abụghị imegide maọbụ imekpà ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ bụrụ na ha akụtughị ụlọ dị etu ahụ ma leghàra ya anya, ị mara na ndị mmadụ ga na-arụzị ụlọ n’ebe ọbụla nà etu ọbụla ha chọrọ, bụ nke ọ kọwara dịka nke adabaghị adaba nà nke megidere ezi ebum

Ihe mberede okporo ụzọ egbuola otu onye n'Nkpor, merụọ ọtụtụ ahụ

Image
OTU onye nọrọ na nsonso a wee zùte ọnwụ mberede ya n’Anambra,ebe mmadụ anọ ndị ọzọ nwètàkwàrà ihe mmerụahụ n’ụdị dị iche iche, dịka ihemberede okporo ụzọ dapụtara na ncherịta ihu ‘Jodon Shopping Mall’ dị na Nkporna mpaghara okporo ụzọ ahụ siri Ọnịtsha gaa Enugu.   Onye jigodi ọkwa dịkaonye na-ahụ maka mmekọrịta oheneze na ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Kamal Musa mèrè ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụndị nta akụkọ na nsonso a bànyere ihe mberede ahụ.   O mere ka a mara naihe mberede okporo ụzọ ahụ metụtara mmadụ ise (ụmụnwoke anọ na otu nwaanyị) mabụrụkwa nke dapụtara n’etiti nnukwu ụgbọala 911 M/Benz e ji ebu mmiri (bụ nkenwere akàrà XB 698 GDD) na Keke enweghị akàrà. Ọ sịkwa na ihe kpatara ihemberede ahụ bụ ịgba oke ọsọ, na ụgbọala ịgbafè ibè ya site n’usoro ezighị ezi.   Maazị Kamal gakwaran’ihu kwuo na ụmụnwoke atọ na otu nwaanyị ahụ nwètàrà mmerụahụ n’ihe mberede ahụ,ebe otu nwoke nwụrụ. Ndị ọrụ FRSC bùùrù mmadụ anọ ahụ nwetara mmerụah

Korona: Ndị Nkpọr ekesàárala ndị ihe na-esiri ike erimeri

ÒTÙ isi ọchịchị obodo Nkpọr a maara dịka ‘Nkpor DevelopmentUnion’ nọrọ na nso-nso a wee kesaara ụfọdụ ndị òtù ha bụ ụmụafọ Nkpọr ọnọdụ dịịrịañaa ihe erimeri dị iche iche, iji mee ka ha ka nwee ihe oriri n’ime oge a ọrịakorona na-enye nsogbu ma na-emekpàkwa ụwa ahụ n’ọtụtụ ụzọ.   Erimeri ahụ e kesàràgụnyèrè àkpà osikapa karịrị narị asaa, ya na nri olilo Semovita, na puku naịrise a tụkwasara n’elu ya, ma bụrụkwa nke ndị dị iche iche si n’ime ógbè iri enwere n’obodo ahụ. Ndị ajadụ na ụfọdụ ndị ọzọ ihe na-esiri ike so na ndị ritaraúrù n’erimeri ahụ e kesàrà. N’okwu ya na mmemme ahụ oge ọ na-ekesàra ha ihe oriri ahụ,onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Innocent Mbagha kọwara na ebumnobi ha jiribute ma kèsàá ihe ahụ bụ iji bèlatara ndị ahụ ritara úrù na ya ihe isi ike dịn’oge a, n’ihi na ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọnọdụ amaghịzị kwụrụ ugbua n’ihi ọrịa korona. O kelere ndị obodo Nkpọr, ma ọnọ n’ụlọ ma ọnọ n’ụzọ ije,maka ịtụkọta ihe oriri na ego ahụ e kesàrà, ma dụọ ha ọdụ ka ha jisie i

Nnukwu ụgbọala agbaala ọkụ na Nkpor

ỌKỤ ọgbụgba nnukwu ụgbọala dapụtara ọzọ na Nkpor nke dịn’okpuru ọchịchị Idemmili North na steeti Anambra na Satọdee gara aga, ka ojiri ihe dịka ọkara gafee elekere iteghete nke abalị.    Nnukwu ụgbọala ahụnke bu ihe e ji edina ala ‘mattresses’, tinyere ụlọ ahịa dị ebe ahụ gbara ọkụgwoogwoo tupu e menyụọ ya.   E kwuru na ihekpatara ọkụ ahụ bụ n’ihi na ụgbọala  ahụbu ibu karịrị ya  lara elu nke ukwu nkemere na o metụrụ eriri ọkụ latrik. N’ihi ya ka o ji gbaa ọkụ, mana ọkọ akọghị ọkwọụgbọala ahụ.   Ozi si n’aka onyeuweojii na-ahụ maka ọdịmma ha na ndị mmadụ (Police Public Relations Officer),SP Haruna Mohammed kwuru na mgbe ha nwetara ozi ahụ ka e zipụrụ ndị uweojii nkeOgidi Divishọn ozugbo bụ ndị mere ngwa ngwa gaba ọrụ ebe ahụ.   O kwukwara sị, “Ndị ọrụna-agbanyụ ọkụ (fire service) gbagakwara ọsọ ozugbo.”   PPRO ahụ kwara arịrịna ka ndị ọrụ ngbanyụ ọkụ ahụ bịaruru ka igwe mmadụ iwe na-ewe (mob) wakporo ụgbọalaha ma were okwute kurie nnukwu ugogbe (windscreen) ya tupu ndị uweojii abịa zọp