Posts

Showing posts with the label Nkem Okeke

Obianọ ehibela atụmatụ inye ọzụzụ maka nchekwa ime obodo

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano agbapeela amụma inye ọzụzụ maka nchekwa imeime obodo dị iche iche na steeti ahụ.   Mmemme ịgbape atụmatụ inye ọzụzụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a chịkọbara site n’aka ụlọọrụ uweojii steeti ahụ.   N’okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na nchekwa bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla, bụzị nke mere na onye ọbụla ga-etinye aka n’ọrụ, nyere ndị ọrụ nchekwa aka ịrụ ọrụ ha site n’inye ha ozi dị mkpa mgbe kwesiri ekwesi, ma mụrụkwa anya ka azụ oge niile, n’ihi na òké anaghị eri ihe onye mụ anya.   Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ osote ya, bụ Dọkịta Nkem Okeke kọwàrà nchekwa imeime obodo (community policing) dịka otu n’ime usoro kacha mma isi belata ma chụọ mpụ na arụrụala ọsọ ụkwụ eru ala na Nigeria, ma kọwaa mkpa ọ dị na Ndị Anambra na ndị ọzọ bi ebi na steeti ahụ ga-ejikọ aka ọnụ, ha na ndị ọrụ nchekwa, iji kwalite ezi ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba na ste

Enugwu-Ukwu echiela Okeke Ezuo II

Image
OSOTE aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịnta Nkem Okeke abụrụla onye  chiri echichi dịka ‘Ezuo Nke Abụọo’ n’Enugwu-Ukwu na Ụmụnri, bụkwa echichi nke e chibụrụ nna ya lagoro mmụọ. Ya bụ nnukwu echichi bụ nke ndị obodo Enugwu-Ukwu nile zukọtara wee chibe ya, bụkwa nke e mere site n’aka eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Ralph Ekpe. Nke a bụ nke e mere na mmemme Ịgụ Arọ nke iri isii, bụ out n’ime nnukwu mmemme pụrụ iche e jiri mara ndị obodo ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’obi eze dị n’Obu Ụmụnri n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra. Mmemme ahụ bụ nnọọ nke kpoghaara ọkụ site n’iji ọtụtụ ọnụ mkpọnala dara ụda nke ukwuu wee sị Igwe Ralph na ndị ichie ya ‘nnọọ’ dịka ha ji Ịgba Eze na egwu Ufie wee na-abata. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ịgọ na ịwa ọjị sochiri, bụkwa nke e butere site n’aka ndị Iyom, Otu Odu na Eze, bụ ndị nwunye Igwe duru wee bịa. Ka ọ na-echibe Dọkịnta Okeke ya bụ echichi, Igwe Ralph kọwara ya dịka nwoke nwere obi umeala na onye metagooro obodo ahụ ọtụtụ ihe otutu n’ụzọ dị