Neni emeela emume Nka-Dịọka
NKA-DIOKA Art and Cultural Festival afọ 2019 e meren’Umudioka Neni nke dị n’okpuru ọchịchị Anaocha bụ nnọọ nkekporo ọkụ dị egwụ. Ndi hazịrị ya bụ ndị otu ọgbọ (age grade) Nwawelugo n’amaegwuruegwu a kpọrọ ‘Mmanka Stadium’. Mmemme a bụ nnọọ nke a na-achịkọba kwa afọ iji gosịpụtaomenala ‘Nwadiọka’, njirimara ya, nakwa akara ahịa ‘Nwadioka’ dịka onye sịteren’ala ‘Dioka”. Ihe dịkarịsịrị mkpa e mere gụnyere ‘Itu Mbubu’, ‘Igbu-ichi’,‘Iwa-eze’, Igosi Mmanwụ dị iche iche, Igba egwu na ihe ndị ọzọ. Ndị so wee kwadommemme a gụnyere Tonimas Insurance Brokers Ltd, FG Onyenwe Enterprises, ChelseaAgric; Mkpunando Aguleri Anambra State, Paul-B Nig. PLC, na ndị ọzọ. Ọ dọtakwarandị welitere isi n’obodo ahụ dịka Igwe Damian Ezeani ‘Igwe Ugonabo Neni’,Onyeisi CEO Tonimas Group of Companies, Chief Sir. Anthony Obiagbaoso Enukeme‘Onowu Neni’, Chief Albert Ibeanu, Chief Raphael Udeze w.g.z Onyeisi Obodo ahụ bụMaazi Albert Nwanekezi n’okwu nnọọ ya, sịrịna mmemme a bụ nke a na-eme kwa afọ iji gosị ụwa