Korona: Akwa mkpuchi ihu achụọla uriọnụ ọsọ n'ọnụ ụmụnwaanyị
Uriọnụ (lipstick) bụ ihe ụmụnwaanyị na-ete n’ọnụ. Ọ bụ otu n’ime ihe e ji achọ mma. Uriọnụ na-eme ka nwaanyị chawapụ ma maa mma ile anya. Uri ọnụ bụ ihe dịbara site n’oge gboo n’ihi na ịchọ mma amaliteghị taa. Ụmụ ụwa bidoro gboo choba mma. N’oge ahụ, a na-ete ọtanjele, uri na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji achọ mma. Uriọnụ na-acha ụdị agwa dị iche iche dịka, ọbara ọbara, oji, ọcha w.d.g. Ọtụtụ mmadụ ejirila ire uri ọnụ na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma mepụta ihe n’ihi na uriọnụ na-aga ahịa n’ụzọ dị egwu. Uriọnụ na akwa mmadụ yi n’ahụ na-agakọta. Ọmụmaatụ: onye yiri akwa na-acha ọbara ọbara, o tee uri ọnụ na-acha ọbara ọbara, ka o wee bụrụ ihe e kwuru ka a na-eme. Otu o dila dị, nsogbu ụmụ nwaanyị nwere gbasara uriọnụ ugbu a bụ na akwa nkpuchi ihu a na-ekpu maka igbochi korona ekweghịzi ha tee uriọnụ. Ha nwaa anwaa tee ya, akwa nkpuchi ihu e hichaa ya. Nke a malitere kemgbe ọrịa korona batara n’ụwa. Ka ihe siri kwụrụ, gọọmenti tiri iwu na onye ọbụla ga na-eji akwa nkpuchi ihu ekpuchi onwe