Posts

Showing posts with the label Nise

Ọrụ amalitela n'okporo ụzọ Enugwu-Ukwu -Nise-Nibo-Agu Awka

N’IMEZUPỤTA ezi ebumnobi ya ịhụ na e nwere ezi okpuru ụzọ nagburugburu niile nke steeti ahụ, gọọmenti steeti Anambra amalitela ọrụidozigharị okporo ụzọ ahụ siri Enugwu-Ukwu wee gaa Nise, gaa Nibo, wee pụta AgụAwka.   Ya bụ ọrụ ndozigharịokporo ụzọ bụ nke Gọvanọ Willie Obianọ bagidere na ya na nsonso a, ma bụrụkwanke Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Marcel Ifejioforgara leta ka ọrụ si aga na ya na nsonso a. N’okwu ya oge o letachara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ, KọmishọnaIfejiọfọr gosipụtara afọ ojuju ya banyere etu ihe si aga nakwa ogoogo e ji arụya bụ ọrụ. O kwupụtakwara obi ụtọ ya banyere etu ụlọọrụ ji ọrụ si arụ ọrụ ma n’ụbọchịụka, iji hụ na a rụpụtara ọtụtụ ebe, ọkachasị ugbu a anwụ ka na-acha, tupuummiri amalitekwa izò nnukwu ọzọ.   O mere ka a mara nae teela ụfọdụ mpaghara ụzọ ahụ malite n’Enugwu-Ukwu ruo na Nise, ma sịkwa na gọọmentikpachara anya wee tinye uchu na mpaghara ahụ, n’ihi na ebe ahụ emebiela nkeukwuu ma dịkwa njọ nke ukwuu. O nyekwazịrị ndị na-agba n