Aka akparala nwaanyị ọtụ mgbere ụmụaka ebe o ku nwa abalị ise
NDỊ ngalaba na-ebu agha megide itumgbere na ịta ụmụaka ahụhụ (Anti-Human Trafficking Child Labour Unit) nke ụlọ Nigeria Immigration Service (NIS) na steeti (Cross River, anwuchikọọla otu nwaanyị na-atu mbgere ụmụaka, Imabong Aniefiok-Samuel ka ku nwa ọhụrụ di abali ise. Ndị ọrụ NIS nwụchikọrọ nwaanyị ahụ na Peace Park dị n’okirikiri Etta Agbor na Calabar. N’ozi nke okwuputa okwu NIS steeti ahụ Supt. Amor Austin tinyere aka na ya site na Calabar kọwara na nnyocha gbara ama na ya bu okwu gbasatara ịtụ nwata. Osote onyeisi (Assistant Comptroller-General), NIS na steeti Cross River, Oriaku Ijeoma Emenike enyela ntụziaka ka a hafee nwaanyị na nwa ọhụrụ ahụ n’aka ndị ọ dị n’aka, National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) maka ime nnyọcha gaa n’ihu ma wepu okwu ụlọikpe. Maazi Oba Jacob, onyeisi ọrụ (Head of Operations) NAPTIP na steeti ahụ onye nabatara nwaanyi na nwa ọhụrụ ahụ kwuru na a ga-eji nwaanyị ahụ were jide ndị ọzọ gbara ọsọ bụ ndị di na mbụ nye i