A kwadola ndị òtù egwuregwu Anambra ka ha gaa merie n'asọmpi Nigeria 2022
AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo adụọla ụmụafọ steeti Anambra nọ na ngalaba egwuregwu ka ha gaa n’ihu ituru ugo na ime nke ọma n’asọmpi egwuregwu dị icheiche ha na-esonye na ya, iji gaa n’ihu na-egosi ụwa na Anambra bụ ìhè nke ala Nigeria n’ezie. Onyeisi ndị ọrụ nyé Gọvanọ (Chief of Staff to the Governor) n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Ernest Ezeajughi bụ ya kwupụtara nke a n’Awka n’aha Gọvanọ Soludo oge ọ na-anọchite anya ya na mmemme izipu ndị ahụ ga-anọchite anya òtù egwuregwu Anambra n’Asọmpi Egwuregwu Ala Nigeria nke afọ 2022 (2022 National Sports Festival), bụkwa nke a ga-eme n’Asaba bụ isi obodo steeti Delta. N’okwu ya n’ebe ahụ, Gọvanọ Soludo kwùrù na ọchịchị ya ga-anọgidesi ike n’ịkwàlite ngalaba egwuregwu steeti ahụ ka ọ nọrọ n’ogoogo kacha elu, ọbụna dịka o kwupụtàrà obi ụtọ ya na òtù egwuregwu Anambra ga-esonye n’asọmpi ahụ, ma kwe nkwà na gọọmenti ya ga-enye ha nkwàdó zuru okè. Dịka ọ na-akpọpụ̀tasị aha ụfọdụ ụmụafọ steeti ahụ megoro nke ọma n’ụdị