Posts

Showing posts with the label Nigeria

Ngana na oke ọchịchọ: Nnukwu nsogbu ji ala anyị aka

NGANA na oke ọchịchọ so n’ihe ndị na-ebute nnukwu nsogbu n’ụwa taa. Onye ngana bụ onye achọghị imetu ihe ọbụla aka, onweghị mgbe o ji achọ ihe ọ na-eme. Ị gwa ya ihe o kwesiri ime, ọ jụ, kama ọ na-achọ nke dị elu. Nke ọbụna a gwara ya ka ọ lụọ, ọ ga-ahụ ihe ọ ga-eji jụ. Oke ọchịchọ bụ mmadụ irọ nrọ ihe kariri ya, ihe ọ rughị ogo ya.   Ngana na oke ọchịchọ na-agbakọkari maka na ọtụtụ ndị dara ngana na-achọ ihe ukwu. Iji maa atụ, mgbe ụfọdụ ka ị ga-ahụ nwokorobia, eziga ya akwụkwọ, onweghị ihe ọ ga-amụta, e ziga ya ahịa, otu abụghị n’ezi. A  sịzịa ka ọ mụọ ọlụ aka, ejula olee nne gi kukororom.   N’ikpeazụ, ịhụ ya ka ọ na-aga iro ogologo, ụgbọala gbafee, ọ gwa gi ego ole a na-ere ya n’ahịa ma gwakwa gị na nke ahụ abụghịrị ya ihe  na o nwere nke galara nnukwu ọnụ bụ ụdị ya ga-anya.   Ihe a wee bụrụ nnukwu nsogbu chere obodo anyị aka mgba. Ụdị ndị a dị na nwoke, dị na nwanyị ma okenye ma ụmụaka. Ihe o  jiri jogbu onwe ya bụ maka na ọ bụ ya na-ebute ohi, ama, igbu ọchụ, ntọrị, ịgwọ ọgwụ, wdg

Nigeria agbàála ahọ iri isii

IGBO sị na nwa puru eze abụghịzị nwata, maka na ọ na-abụ ihegbàá ahọ, ọ gbanye mgbọrọgwụ.   Taa ka ala Nigeriana-emerùbe mmemme ncheta ọgbụgba ahọ iri isii o jiri nwere onwe ya pụọ n’aka ọchịchịndị ọcha, n’ahọ 1960. Ala Nigeria, dịka akụkọ ntọala ya siri dị, bụ ala dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Africa, ma bụrụkwa nke ndị bi n’ime ya bibụ ichè iche, wee ruo mgbe ndị ọcha bàtàrà n’ahọ 1901 ịchị ha bụ ndị bi na mpaghara ahụ. Tupu oge ahụ, ndị ahụ na-azagasị aha dị iche iche, nọọrọ onwe ha ma nwekwa ndị ọchịchị nke ha, wee ruo mgbe ahụ ndị ọcha bịara. Ndị ọcha kèkọtàra ebe ahụ niile ka ọ dịzie mpaghara abụọ — mpaghara mgbago ugwu na mpaghara ndịdà anyanwụ.   Ka o ruru n’ahọ1914, ha chịkọrọ mpaghara abụọ ahụ ọnụ ka ha bụrụzie otu mbà; ha wee kpọọ ahaya ‘Nigeria’. Nke a bụ nke e mere site n’aka Gọvanọ mbụ chịrị ala ahụ, bụ MaazịLord Lugard.   Ka nke ahụ gachara, ụfọdụ ndị ọzọ jiri ọkwa ọchịchị ahụ bụcha ndị ọcha, wee ruo oge ala Nigeria nwèère onwe ya pụọ n’aka ọchịchị ndị ọcha. Ndị ahụ gụnyè

Ndị Nigeria bi Namibia amalitela ịnye ụmụ ha ihe ọmụmụ na Igbo, Hausa, Yoruba

NDỊ Nigeria bi Namibia, site n’atụmatụ ndịisi otu jikọtaraha bụ Association of Nigerians in Namibia (ANINAM) na nkwado nke ọnụ na-ekwuruNigeria na mba ahụ Nigeria High Commissioner to Namibia, Ambassador Lilian Onohamalitela ịhaziri ụmụ ha ihe ọmụmụ n’asụsụ atọ a kacha mara n’ala anyị bụNigeria – Hausa, Igbo na Yoruba.   Nke a wetere ọńụn’ebe ndị Nigeria bi Namibia, nke dị na mba South Africa nọ n’ihi na haemejuputala ebumnuche ha bụ ichekwaba asụsụ ha dịka ha nọ n’ụzọ ije na mba ọzọsite n’ịkụziri ụmụ ha asụsụ Nigeira.   Amb. Onoh kwuru sị,dịka onye na-anọchite Nigeria na Namibia na ya nwere afọ ojuju na ndị ahụ yana-anọchitere.   O kwuru sị: “N’imeafọ a na ihe iche aka mgba so ya, ANINAM haziri ma malite ịkụziri ụmụ anyị naNamibia asụsụ ala anyị. Nne na nna wepụtara onwe ha, na-ehicha ụlọ ahụ, weta akọrọngwaniile; ọtụtụ sonyere nke mere na a ga-abawanye ebe ahụ maka ezi mmụta. E silana nkuzi asụsụ ahụ rite uru ọzọ. Nne na nna na-abịazị na Satọdee, ha na ụmụ hama hazie ihe ańụrị na egw

COVID-19: Ụlọọrụ China ejirila ihe erimeri kwàdo gọọmenti Anambra

NNEKWU ọkụkọ sị na ọ bụ ihe o nwere ka o ji emere okeọkpa ọgọ,ebe ndị Igbo sị na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbaa ụfụfụ.   Ka ọ dị taa, n’iji sịya jisie ike, otù ụlọọrụ ngo mba China ejirila ihe erimeri dị iche iche weekwàdo gọọmenti steeti Anambra n’agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje korona nàmmetụta ya dị iche iche n’ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.   Mmemme inyefè iheoriri ahụ n’aka gọọmenti bụ nke weere ọnọdụ na nso nso a n’obí gọọmenti dịn’Awka, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị so n’òtù ọrụ gbanụ gbanụ ahụ gọọmenti steetiahụ guzobere maka ọrịa ahụ sonyèrè na ya.   Oge ọ na-enyefè ihendị ahụ n’aka gọọmenti, onye na-ahụ maka mmekọrịta ụlọọrụ ahụ na ọhaneze, bụMaazị Abdulfata Abdulraheem kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka mbọ dị iche iche ọgbagòrò nà ihe o mepụtagoro n’agha ahụ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa ahụ nà mmetụtanke oge ihe isi ike a n’ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.   O mere ka a mara na ọbụ ihe ndị ahụ mèrè ha jiri kpebie ịbịa kwàdo ọchịchị steeti ahụ, iji ịsị yajide ka o ji n’agha ahụ ọ na-ebu;