Ngana na oke ọchịchọ: Nnukwu nsogbu ji ala anyị aka
NGANA na oke ọchịchọ so n’ihe ndị na-ebute nnukwu nsogbu n’ụwa taa. Onye ngana bụ onye achọghị imetu ihe ọbụla aka, onweghị mgbe o ji achọ ihe ọ na-eme. Ị gwa ya ihe o kwesiri ime, ọ jụ, kama ọ na-achọ nke dị elu. Nke ọbụna a gwara ya ka ọ lụọ, ọ ga-ahụ ihe ọ ga-eji jụ. Oke ọchịchọ bụ mmadụ irọ nrọ ihe kariri ya, ihe ọ rughị ogo ya. Ngana na oke ọchịchọ na-agbakọkari maka na ọtụtụ ndị dara ngana na-achọ ihe ukwu. Iji maa atụ, mgbe ụfọdụ ka ị ga-ahụ nwokorobia, eziga ya akwụkwọ, onweghị ihe ọ ga-amụta, e ziga ya ahịa, otu abụghị n’ezi. A sịzịa ka ọ mụọ ọlụ aka, ejula olee nne gi kukororom. N’ikpeazụ, ịhụ ya ka ọ na-aga iro ogologo, ụgbọala gbafee, ọ gwa gi ego ole a na-ere ya n’ahịa ma gwakwa gị na nke ahụ abụghịrị ya ihe na o nwere nke galara nnukwu ọnụ bụ ụdị ya ga-anya. Ihe a wee bụrụ nnukwu nsogbu chere obodo anyị aka mgba. Ụdị ndị a dị na nwoke, dị na nwanyị ma okenye ma ụmụaka. Ihe o jiri jogbu onwe ya bụ maka na ọ bụ ya na-ebute ohi, ama, igbu ọchụ, ntọrị, ịgwọ ọgwụ, wdg