Posts

Showing posts with the label Niger-Delta

E mebiela ọtụtụ ebe a na-esucha mmanụ agbidi iwu akwadòghị̀ na Niger Delta

Image
ISI ụlọọrụ nchekwa ala Nigeria, Defence Headquarters (DHQ), ekwuputala na ndị agha achọpụtala ma mebie ebe nhanzi mmanụ e gwuputara n’ime ala iwu akwadoghị, bụ nke karịrị iri anọ n’ọnụọgụ, n’ime izuụka abụọ.   DHQ kwukwara na ndị agha ahụ chọpụtakwara ma mebie ebe a na-agbanye mmanụ e jiri igwe rụọ, nke dị otu narị na iri isii na ise, ovun e ji esi mmanụ dị iri asaa na abụọ, olulu ebe a na-ahazi mmanụ dị iri abụọ na atọ, na ụgbọ mmiri e jiri osisi rụọ dị ise n’ọnụọgụ; ma nweta ihe karịrị otu nde lita mmanụ agbidi, e zuru n’ohi, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.    Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n’isi ụlọọrụ ndị agha ala Nigeria, bụ Major General Bernard Onyeuko kwuputara nke a, ma mekwa ka a mara na a hafeela ihe ndị ahụ niile e nwetere ebe ahụ na ndị niile e jidekwara n’ebe ahụ n’aka ndị ga-eleba anya na ya bụ okwu.  Onyeuko, n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ banyere ọrụ ndị agha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ bụ nke a chịkọbara n’agbata Mee 19 ruo Juunu 2, sị na agha a na-eb