Posts

Showing posts with the label Niger

Na Niger, ndị mụ ụmụakwụkwọ 13 onyenkuzi bu nje HIV dinara akpọọla oku maka ikpemkwụmọtọ

NNE na nna ụmụakwụkwọ ahụ dị iri na atọ n’ọnụọgụ bụ ndị onyenkuzi, Mohammed Galadima bu nje HIV metọrọ na Karanbande nke dị n’okpuru ọchịchị Borgu na steeti Niger, a kpọọla oku ka e nye onyenkuzi ahụ ntaramahụhụ dị egwu, iji dọọ ndị ọzọ aka na ntị.   Ha kwuru sị: “Ọ na-ewute anyị otu onyenkuzi ahụ siri metọ obere ụmụaka anyị. Anyị na-arịọ ka e nye ya ntaramahụhụ dị egwu iji dọọ ndị ọzọ ga-achọ ịkpa ụdị arụ ahụ aka na nti, ọ bụghị so na steeti ahụ kama n’ala anyị niile gbaa gburugburu, aka na ntị.”   Otu n’ime ndị nne na nna ahụ, Idris Haruna, bụ onye odozi ụgbọala kwara arịrị ihe onyenkuzi ahụ mere nwa ya nwaanyị gbara afọ ise ma kwuo na sọọsọ ma e nyere Galadima ntaramahụhụ zuru oke na ya agaghị enwe obi ańụrị.   Nwoke ahụ mụtara ụmụ isii kọwara na ya amaghị banyere ọnọdụ ahụ wee ganye na nwa ya nwaanyị agwa nne ya ihe onyenkuzi ahụ mere ya, nke mere ka o mee ka ya mata.   O kwuru sị: “N’echi ya, agbara m gaa n’ụlọakwụkwọ ahụ nye mkpesa ma ha gwara m lawa na e mechaa na m ga-enweta oz