Posts

Showing posts with the label Nghoputa Ochichi

INEC ekesaala ihe a ga-eji tụọ akwụkwọ ụbọchị Satọdee

NA nkwadobe ya maka ịchịkọbà ntụliaka ghe anya oghe na nhọpụta ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee, ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka nchịkọba nhọpụta ọchịchị n’ala Nigeria, bụ ‘Independent Electoral Commission’ (INEC), ngalaba ya nke steeti Anambra ekesaala ma busàsịa ihe dị iche iche a ga-eji wee tụọ ya bụ akwụkwọ. Ya bụ nkesà akụrụngwa na ihe ndị ọzọ bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Wednesday n’ụlọ ọba ego ala anyị dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, ebe e siri wee busaa ha n’okpuru ọchịchị niile e nwere na ya bụ steeti. N’ajụjụ ọnụ ndị nta akụkọ gbàrà ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọ INEC na steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwachukwu Ọrjị mere ka a mara na ihe e ji ekesà ma na-ebusa ya n’oge bụ ka e wee hụ na ya bụ akụrụngwa na ihe ndị ahụ niile ruchara ebe a ga-eji ha wee rụọ ọrụ n’oge ma zùkwa òkè, n’ihi na a ga-anọkwa ebe ahụ e bùgara ha wee wepùta ogè nyòchagharị ha niile ọzọ, iji hụ na o nweghị nke ọbụla na-eri mperi, ma ọ bụ na-enwe nsògbu tupu ụbọchị ahụ a ga-eme nhọpụta. Ọ sị na ọ bụ ụbọchị Satọdee ahụ a

Pụtanu tụnyere APGA ka Obiano lụọ ọlụ ya nke ọma – Uwakwe

ONYEISI ahịa ọgbọ osisi (timber market) n’Umuokpu Awka bụ Uwakwe Ukaegbu a gwala ndị steeti Anambra okwu banyere ibinye aka nke a ga-eme na Satọdee ọnwa Maachị ga-adị n’abali iteghete maka ndị na-anọchite anya ebe dị iche iche n’ụlọ nzụkọ omebe iwu steeti ahụ (House of Assembly). Ọ rịọkwara ọha na eze arịrịọ ka ha tụnyere otu APGA ka r wee nyere aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Obiano aka n’ịlụ ezi ọlụ nke ọ na-alụ.   O kwukwara na ya onwe ya na-ezisa ozi ka ndị mmadụ pụta n’igwe ma tụnyere ha maka ọdịmma nke steeti ahụ. O jikwa ohere ahụ kelee gọvanọ maka ọlụ ọma ya tinyere ịkwụ ndị ọlụ ụgwọ. O kwukwara na ndị ahịa ketakwara oke n’ọlụ ọma ya site n’akatamkpo ego o nyere ha nke ha ji na-alụ ụzọ ma na-edozikwa ebe nile mebiri emebi n’ọgbọ osisi. O kpọkuru ndị na-azọ ọchịchị ka ha jiri nwayọọ na ndọrọndọrọ abụghị tigbuo zọgbuo. Ọ gakwara n’ihu rịọ ndị ntorobịa ka ha ghara ịkpa aghara n’ụbọchị ahụ. Ọ rịokwara gọvanọ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka site n’iche ngwuru (fence) n’ọgbọ osisi

A kpọkuola ndị Anambra ka ha tụnyere APGA na ntụliaka ụbọchị Satọdee

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ụmụafọ steeti Anambra ka ha tụnyere ndị dị iche iche ji otu ndọrọ ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) azọ ọkwa ịga ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra na ntụliaka ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee. Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a n’Awka oge ya na ndị ọrụ oyibo steeti ahụ na-akparịta ụka, bụkwazi nke ọ nọrọ na ya wee mee ka ha mara oke mkpà ọ dị na otu ndọrọ ndọrọ ahụ nwetara mmeri dara ụda na ya bụ ntụliaka. Ọ kọwara nhọpụta ahụ a ga-eme n’ụbọchị Satọdee dịka nke nwere ọtụtụ ihe so ya n’azụ, nakwa nke pụrụ inwe mmetụta pụtara ìhè n’ọchịchị steeti ahụ. O mere ka a mara na dịka ọ bụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA ji ọkwa ọchịchị na steeti ahụ ugbu a, na ọ bụrụ na e nweghị ọkà n’ọnụ ọgụ ndị otu ndọrọ ndọrọ ahụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, na o nwere ike ibì ezi ọchịchị dị na ya bụ steeti ugbu a aka ọjọọ, ma gbaghachikwa aka elekere azụ n’ebe o metụtara ịkwàlite ọdịmma ndị ọrụ oyibo steeti ahụ nakwa ebe o metụtara ya bụ ọrụ mme