N'Awka, ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe maka ọnọdụ nchekwa
ỤFỌDỤ ụmụnwaanyị nọrọ na nsonso a wee mee ngagharịiwe n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bànyere ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ na-arị ibe ya elu na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria ugbua. Ọ bụ ngalaba ụmụnwaanyị nke òtù nkịtị a maara dịka ‘Igbos for a Progressive Nigeria (IPAN)’ mere ngagharịiwe a, ma bụrụkwa nke ha mere na mpaghara ụzọ Amawbia dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka South’, ebe ha nọrọ wee katọọ igbusi mmadụ, nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa, nà imemìlà ndụ ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha ma na steeti ahụ ma na mpaghara ebe dị iche iche. N’okwu ya oge ha na-eme ngagharịiwe ahụ, onye ndu ngalaba ụmụnwaanyị n’òtù IPAN, bụ Oriakụ Juliet Ezenwosu mèrè ka a mara na ya bụ nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa na-echuzị ha ụra ma na-agbazịkwa anyammiri, bụ nke mere ha jiri hụta ya dịka ihe dị mkpà, ịtụnye ụtụ nke ha na olu nke ha iji wèta ya bụ ajọ ọnọdụ na njedobe. O jikwazịrị aha òtù ahụ wee kpọọ òkù ma rịọ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù, ndịisi ụlọọrụ nchekwa dị iche iche na ndị ọzọ ọnụ na