Posts

Showing posts with the label Nga

Atọhapụla nwoke jere nga maka ikpọga agbataobi ya ụlọọgwụ

Chris Anyichie   OTU nwoke nke a na-ebochị ọnụ ma tụkwa ya ñga maka ịgbu agbataobị ya ka ọkpọgachara ya n’ụlọ ọgwụ abụrụla onye nweere onwe ya ka afọ abụọ gasiri. Nwoke a bụ Maazị Chidiebere Onwumere, bụ onye Umuagbaghagha n’okpuru ọchịchị Osisiọma nke Abia Steeti ka a kpọchiri ka ebochichara ya ọnụ na ọ bụ ya gburu agbata obi ya, bụ Uzochi Chinyere, bụ onye nke bikwa otu ebe ahụ nwoke a bi na ya. Ka ọ na-akọwara ndị obodo Umuagbaghagha n’Osisioma Abia Steetị, ihe mere mgbe akpọpụtachara ya n’ụlọ nga nke dị n’Afara, Umuahia, n’ubochị Tuzdee, Maazi Chidiebere, bụ onye abụ otuto juputara n’ọnụ nokwa na-ekele Chineke maka ịnapụta ya n’ahụhụ ọtara afọ abụọ n’ihi ịhe ọ maghị ihe gbasara ya. O kwuru na ọ bụ ebe ọchọrọ ka ọ zọpụta agbataobi ya ka o ji wee nata ntaramaahụhụ a. Maazi Chidiebere kwuru okwu si, “aloghachirim ebe m bi n’Umujiji Isiala Osisioma n’ ebe elekele nke isii na mgbede ka izu ụka abụọ gara aga n’obodo m ebe m gara ịgbukota nakwa ime mkpụrụ akwụ ka m hụrụ agbataobi m ka o d