Ọrụ Ugbo: Gọọmenti Anambra ekèéla ndị ọrụ ugbo mkpụrụ akụkụ na Neni
IGBO sị na onye akọghị anaghị egwute, ma sịkwa na ọ na-abụ awụnyere dike ji na mbụbọ, o were obi dimkpa mapuo ala. N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ekesàála mkpụrụ akụmakụ dị iche iche na ihe e ji akọ ọrụ ugbonyégárá ndị ọrụ ugbo ruru narị abụọ n’ọnụọgụgụ na Neni, dị n’okpuru ọchịchị imeobodo Anaọcha, maka ịkọ ọrụ ugbo ahọ a. N’okwu ya mgbe ọna-ekesa ihe ọrụ ugbo ahụ n’aha gọọmenti, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo nasteeti ahụ, bụ Maazị Nnamdị Ọnụkwụba, nke ọ bụ Dọkịta Okey Okwuosa nọchitereanya ya, mere ka a mara na atụmatụ ahụ bụ iji kwàdo ma kwàlite ọrụ ugbo n’imesteeti ahụ. Ọ kọwapụtara mkpa ọdị, bụ ịkọ ọrụ ugbo nke ukwu, ọ kachasị n’oge ugbua ọtụtụ obodo dị iche iche namba ụwa tinyezịrị uche n’ọrịa korona, wee gbakụtazie ngalaba ọrụ ugbo azụ. O kwukwazịrị na ya bụatụmatụ ga-enye aja ịme ka e nwee nri gbaa nyụụ n’ime steeti ahụ, ma gharakwainwe ụkọ nri n’ọdịnihu, ọ kachasị oge ihe gbasaara ọrịa nje korona dajụọrọ. Ọ dụkwara ndị ọrụugbo ahụ soro nweta ihe ahụ e kèrè k