Onyeisi ndi agha agaala njem nleta n'Enugu
N’ỊGBASO mkpebi ya iweta ezi ọnọdụ nchekwa n’ala Nigreria na ịkwalite ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ ya, onyeisi ndị ọrụ agha ala Nigeria ‘Chief of Army Staff’ ahụ a kpọlitere n’ọkwa ọhụrụ, ‘Major General’ Farouk Yahaya agaala njem ileta ndị ọrụ agha nọ na mpaghara ’82 Division’ iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ. Ya bụ njem nleta bụ nke onyeisi ahụ gara n’isi ụlọọrụ mpaghara 82 ahụ bụ ‘Abakpa Cantonment’ dị na steeti Enugu, bụkwa ebe onyeisi mpaghara ahụ, bụ Major General Taoreed Lagbaja na ndị ọrụ ya nọrọ wee nabata ya n’obi añụrị, maka na nke ahụ bụ njem nleta mbụ ọ na-abịa na mpaghara ahụ dịka onyeisi ọrụ agha ala Nigeria. N’okwu ya n’ebe ahụ, ‘Major General’ Yahaya kpọkuru ndị ọrụ ya ka ha dị uchu n’ọrụ ma na-arụkwa ya n’ụzọ iwu kwàdòrò. O kwere nkwà na ọ ga-eme ihe ọbụla o nwere ike iji kwàlite ọnọdụ obibindụ ha ma nyekwa ha ezi nkwàdo kwesiri ekwesi, iji wee rụọ ọrụ ha nke ọma dịka a tụrụ anya. Yahaya (nke abụọ n’etiti) oge ọ na-agbape ụlọ ahụ a rụgharịrị arụgharị Yahaya (nke abụọ n’